Song of Solomon 5

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

1Abatala m nʼubi m a gbara ogige, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Achịkọtala m máá ya na ụda m,
arachakwala m mmanụ aṅụ m na ugbugbo mmanụ aṅụ.
Aṅụkwala m mmiri ara ehi na mmanya m.
Ndị Enyi

Rie, ṅụọkwa, unu ndị bụ enyi;
ṅụjuo afọ, unu ndị hụrụ onwe unu nʼanya.
Onye a hụrụ nʼanya

2A rahụrụ m ụra, ma obi m mụ anya.
Gee ntị, onye ahụ m hụrụ nʼanya na-akụ aka nʼibo ọnụ ụzọ. a
“Megheere m ụzọ, nwanne m nwanyị, onye m hụrụ nʼanya,
nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.
Igirigi ezokwasịla m nʼisi,
agịrị isi m jupụtara na mmiri nke abalị.”
3Eyipụlarị m uwe m.
Ọ bụ m yirikwa ha ọzọ?
Asaala m ụkwụ m,
aga m eme ka ha ruo unyi ọzọ?
4Onye m hụrụ nʼanya gbatịrị aka ya imeghe ụzọ,
mgbe ahụ, obi m chọsikwara ya ike.
5Mụ onwe m biliri imeghere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma aka m abụọ jupụtakwara na mmanụ máá,
mmanụ máá si na mkpịsịaka m niile na-atapụsi,
nʼelu ihe mkpọchi nke ibo.
6Mgbe m megheere onye m hụrụ nʼanya ụzọ,
ma lee, ọ nọkwaghị ya, ọ laala.
Obi fepụrụ m mgbe ọ pụwara.
Elegharịrị m anya chọọ ya ma ahụghị m ya ebe ọbụla.
Akpọrọ m ya oku ma ọ zaghị.
7Ndị nche hụrụ m
mgbe ha na-agagharị nʼobodo, b
ha tiri m ihe merụọ m ahụ.
Ndị nche mgbidi obodo
napụrụ m akwa mkpuchi m.
8Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,
ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ nʼanya,
gịnị ka unu ga-agwa ya?
Gwa ya na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụchasịa nʼahụ.
Ndị Enyi

9Gị nwanyị kachasị mma,
olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ?
Olee otu onye ị hụrụ nʼanya si dị mma karịa ndị ọzọ
nke i ji enye anyị iwu dị otu a?
Onye a hụrụ nʼanya

10Onye m hụrụ nʼanya chapụrụ achapụ, dị mma ile anya.
Ọ pụrụ iche nʼetiti puku ndị nwoke iri.
11Isi ya dịka ọlaedo a nụchara anụcha,
agịrị isi ya na-eruda dịka igu nkwụ,
na-ejikwa nji dịka ugolọma.
12Anya ya abụọ dịka nduru
nọ nʼakụkụ mmiri iyi
nke e jiri mmiri ara ehi sachaa,
dịka nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị.
13Nti ya abụọ dị ka ihe ndina ụda
Ụda nwere isisi ọma nke na-eme mmadụ obi ụtọ.

nke jupụtara na mmanụ isi ụtọ.
Egbugbere ọnụ ya dị ka okoko urodi,
nke na-agbụsị mmanụ máá.
14Aka ya abụọ dị ka mkpara ọlaedo a kpụziri akpụzi,
nke a hịọnyere nkume oke ọnụahịa beril nʼime ya.
Ahụ ya na-akwọ mụrụmụrụ dịka ọdụ
nke e ji nkume dị oke ọnụahịa safaia chọọ mma.
15Ogwe ụkwụ ya abụọ dị ka ogidi e ji nkume mabụl kpụọ,
nke e ji ọlaedo a ṅụchara anụcha tọọ ntọala ha.
Ụdịdị ya dị ka Lebanọn,
dịkwa oke ọnụ dịka osisi sida ya.
16Ọnụ ya bụ ihe tọkarịsịrị ụtọ nʼonwe ya,
ihe niile banyere ya dị mma nʼile anya.
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
onye dị otu a bụ onye ahụ m hụrụ nʼanya, ọ bụkwa enyi m.
Copyright information for IboBIU